Native Bible

2 Corinthians 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.

2 Corinthians 8:3 in English

2 Corinthians 8:3 · Berean Standard Bible

For I testify that they gave according to their ability and even beyond it. Of their own accord,

Context

1Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia. 2Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. 3Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta. 4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 5Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.