2 Ndị Kọrint 8:21
2 Corinthians 8:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.
2 Corinthians 8:21 in English
2 Corinthians 8:21 · Berean Standard Bible
For we are taking great care to do what is right, not only in the eyes of the Lord, but also in the eyes of men.
Context
19Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka. 20Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a. 21Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa. 22Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ. 23Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.