2 Ndị Kọrint 6:15
2 Corinthians 6:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?
2 Corinthians 6:15 in English
2 Corinthians 6:15 · Berean Standard Bible
What harmony is there between Christ and Belial?* Or what does a believer have in common with an unbeliever?
Context
13Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ. 14Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? 15Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ? 16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru,
“M ga-ebi nʼime ha.
Jegharịakwa nʼime ha.
M ga-abụkwa Chineke ha,
ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”* 17Ya mere,
“Sinụ nʼetiti ha pụta.
Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ.
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.