2 Ndị Kọrint 6:12
2 Corinthians 6:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ.
2 Corinthians 6:12 in English
2 Corinthians 6:12 · Berean Standard Bible
It is not our affection, but yours, that is restrained.
Context
10Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile. 11Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu. 12Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ. 13Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ. 14Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.