2 Ndị Kọrint 5:9
2 Corinthians 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ.
2 Corinthians 5:9 in English
2 Corinthians 5:9 · Berean Standard Bible
So we aspire to please Him, whether we are here in this body or away from it.
Context
7Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ. 8Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya. 9Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ. 10Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ. 11Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.