2 Ndị Kọrint 4:1
2 Corinthians 4:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi.
2 Corinthians 4:1 in English
2 Corinthians 4:1 · Berean Standard Bible
Therefore, since God in His mercy has given us this ministry,* we do not lose heart.
Context
1Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi. 2Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke. 3Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.