2 Ndị Kọrint 11:2
2 Corinthians 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke.
2 Corinthians 11:2 in English
2 Corinthians 11:2 · Berean Standard Bible
I am jealous for you with a godly jealousy. For I promised you to one husband, to present you as a pure virgin to Christ.
Context
1Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m. 2Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke. 3Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi. 4Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.