2 Ndị Kọrint 10:4
2 Corinthians 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi.
2 Corinthians 10:4 in English
2 Corinthians 10:4 · Berean Standard Bible
The weapons of our warfare are not the weapons of the world. Instead, they have divine power to demolish strongholds.
Context
2Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya. 3Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị. 4Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi. 5Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst. 6Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.