2 Ndị Kọrint 10:16
2 Corinthians 10:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ.
2 Corinthians 10:16 in English
2 Corinthians 10:16 · Berean Standard Bible
so that we can preach the gospel in the regions beyond you. Then we will not be boasting in the work already done in another man’s territory.
Context
14Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst. 15Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto. 16Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ. 17Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”* 18Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.
10:17 Jer 9:24
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.