2 Ndị Kọrint 1:8
2 Corinthians 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.
2 Corinthians 1:8 in English
2 Corinthians 1:8 · Berean Standard Bible
We do not want you to be unaware, brothers, of the hardships we encountered in the province of Asia.* We were under a burden far beyond our ability to endure, so that we despaired even of life.
Context
6Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. 7Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata. 8Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ. 9Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie. 10Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.