Native Bible

2 Corinthians 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.

2 Corinthians 1:6 in English

2 Corinthians 1:6 · Berean Standard Bible

If we are afflicted, it is for your comfort and salvation; if we are comforted, it is for your comfort, which accomplishes in you patient endurance of the same sufferings we experience.

Context

4Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke. 5Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst. 6Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. 7Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata. 8Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.