2 Ihe E Mere 9:8
2 Chronicles 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ. O debere gị nʼocheeze ya dịka eze ịchị nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke gị. Nʼihi ịhụnanya nke Chineke gị nwere nʼebe Izrel nọ, na mmasị ya ime ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. O meela gị eze ha, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.”
2 Chronicles 9:8 in English
2 Chronicles 9:8 · Berean Standard Bible
Blessed be the LORD your God, who has delighted in you to set you on His throne to be king for the LORD your God. Because your God loved Israel enough to establish them forever, He has made you king over them to carry out justice and righteousness.”
Context
6Ma ekwenyeghị m ihe ha kwuru tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara nke ịdị ukwuu amamihe gị. Ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ. 7Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị. 8Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ. O debere gị nʼocheeze ya dịka eze ịchị nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke gị. Nʼihi ịhụnanya nke Chineke gị nwere nʼebe Izrel nọ, na mmasị ya ime ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. O meela gị eze ha, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.” 9Emesịa, O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ụda dị iche iche, na nkume oke ọnụahịa dị iche iche. Enwebeghị ụdị ụda dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn. 10Ndị ohu Hiram na ndị ohu Solomọn bubatara ọlaedo site nʼỌfịa. Ha butekwara osisi algụm, na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.