2 Ihe E Mere 9:13
2 Chronicles 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,*
2 Chronicles 9:13 in English
2 Chronicles 9:13 · Berean Standard Bible
The weight of gold that came to Solomon each year was 666 talents,*
Context
11Eze ji osisi algụm ndị ahụ mee nkwasa nrigo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. O nwebeghị oge ọzọ e nwere ụdị ngwa egwu e ji osisi ọma dị otu a kwaa nʼala Juda niile. 12Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ. O nyere ya karịa ihe niile o wetaara ya. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi. 13Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,* 14na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa. Ọzọkwa, ndị eze niile nke dị Arebịa na ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ, na-enwetara Solomọn ọlaọcha na ọlaedo. 15Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram isii ka e ji kpụọ ọta ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.