Native Bible

2 Chronicles 8:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile.

2 Chronicles 8:15 in English

2 Chronicles 8:15 · Berean Standard Bible

They did not turn aside from the king’s command regarding the priests or the Levites or any matter concerning the treasuries.

Context

13ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu. 14O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu. 15Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile. 16A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 17Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.