Native Bible

2 Chronicles 8:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu.

2 Chronicles 8:14 in English

2 Chronicles 8:14 · Berean Standard Bible

In keeping with the ordinances of his father David, Solomon appointed the divisions of the priests over their service, and the Levites for their duties to offer praise and to minister before the priests according to the daily requirement. He also appointed gatekeepers by their divisions at each gate, for this had been the command of David, the man of God.

Context

12Emesịa, Solomọn chụrụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke o wuru nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu ahụ, 13ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu. 14O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu. 15Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile. 16A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.