Native Bible

2 Chronicles 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu,

2 Chronicles 7:13 in English

2 Chronicles 7:13 · Berean Standard Bible

If I close the sky so there is no rain, or if I command the locust to devour the land, or if I send a plague among My people,

Context

11Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya. 12Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja. 13“Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu, 14ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu. 15Anya m ga-eghere oghe mgbe niile; otu a kwa, ntị m ga-egherekwa oghe ịhụ na ịnụ ekpere niile a na-ekpe nʼụlọnsọ a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.