Native Bible

2 Chronicles 7:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.

2 Chronicles 7:12 in English

2 Chronicles 7:12 · Berean Standard Bible

the LORD appeared to him at night and said to him: “I have heard your prayer and have chosen this place for Myself as a house of sacrifice.

Context

10Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel. 11Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya. 12Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja. 13“Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu, 14ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.