2 Ihe E Mere 6:8
2 Chronicles 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.
2 Chronicles 6:8 in English
2 Chronicles 6:8 · Berean Standard Bible
But the LORD said to my father David, ‘Since it was in your heart to build a house for My Name, you have done well to have this in your heart.
Context
6Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’ 7“Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel. 8Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. 9Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’ 10“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.