2 Ihe E Mere 6:10
2 Chronicles 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
2 Chronicles 6:10 in English
2 Chronicles 6:10 · Berean Standard Bible
Now the LORD has fulfilled the word that He spoke. I have succeeded my father David, and I sit on the throne of Israel, as the LORD promised. I have built the house for the Name of the LORD, the God of Israel.
Context
8Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. 9Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’ 10“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel. 11Nʼebe ahụ ka m dọbara igbe ọgbụgba ndụ, nʼime ya ka ọgbụgba Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na ụmụ Izrel gbara.” 12Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.