2 Ihe E Mere 6:35
2 Chronicles 6:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ.
2 Chronicles 6:35 in English
2 Chronicles 6:35 · Berean Standard Bible
then may You hear from heaven their prayer and their plea, and may You uphold their cause.
Context
33mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru. 34“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere, 35mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ. 36“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro, ndị ga-adọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso; 37ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe a dọtara ha nʼagha, rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, meekwa ajọ omume.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.