Native Bible

2 Chronicles 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị Livayị buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.

2 Chronicles 5:4 in English

2 Chronicles 5:4 · Berean Standard Bible

When all the elders of Israel had arrived, the Levites took up the ark,

Context

2Mgbe ahụ, Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel niile, na ndịisi ebo Izrel niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile na Jerusalem, maka ị site na Zayọn, bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 3Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim, nke bụ ọnwa asaa nʼafọ. 4Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị Livayị buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ. 5Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja bụ ndị Livayị buliri ha elu. 6Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.