2 Ihe E Mere 4:18
2 Chronicles 4:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ.
2 Chronicles 4:18 in English
2 Chronicles 4:18 · Berean Standard Bible
Solomon made all these articles in such great abundance that the weight of the bronze could not be determined.
Context
16na ite niile, shọvel niile, ihe ịgụrụ anụ niile na ihe ngwongwo ndị ọzọ ya na ha so.
Ihe niile nke Huram-Abi mere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz e hichaziri nke ọma. 17Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan, ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a. 18Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ. 19Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ,
ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ,
na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, 20ihe ịdọkwasị oriọna niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, ha na oriọna ha niile, ka ọ na-enwu nʼihu ime ime ebe nsọ, dịka e nyere nʼiwu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.