2 Ihe E Mere 36:22
2 Chronicles 36:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
2 Chronicles 36:22 in English
2 Chronicles 36:22 · Berean Standard Bible
In the first year of Cyrus king of Persia, to fulfill the word of the LORD spoken through Jeremiah, the LORD stirred the spirit of Cyrus king of Persia to send a proclamation throughout his kingdom and to put it in writing as follows:
Context
20Ha buuru ndị fọdụrụ, bụ ndị niile gbanarịrị mma agha, gaa Babilọn, ha ghọrọ ya, ghọkwara ụmụ ya ndị nọchiri anya ya, ndị ohu, tutu ruo mgbe ehiwere alaeze Peshịa. 21Ala ahụ nwere ụbọchị izuike niile kwesiri ya nʼebe o zuruoke, nʼoge niile nke ịtọgbọ nʼefu ya, o zuru ike, ruo mgbe iri afọ asaa ahụ zuru, nʼimezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma. 22Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, 23“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru:
“ ‘Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka Onyenwe anyị Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”
36:9 Otu akwụkwọ ndị Hibru, ụfọdụ akwụkwọ ndị ọzọ na nke Siriak, ma karịchasịa akwụkwọ ndị Hibru na-ede afọ asatọ. 2Ez 24:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.