Native Bible

2 Chronicles 36:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ.

2 Chronicles 36:2 in English

2 Chronicles 36:2 · Berean Standard Bible

Jehoahaz * was twenty-three years old when he became king, and he reigned in Jerusalem three months.

Context

1Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz, nwa nwoke Josaya mee ya eze na Jerusalem, nʼọnọdụ nna ya. 2Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. 3Eze Ijipt chụdara ya site nʼọchịchị na Jerusalem, kwagide ndị Juda ka ha tụọra ya ụtụ narị talenti ọlaọcha na otu talenti ọlaedo. 4Eze Ijipt mere Eliakịm, otu nwanne Jehoahaz, eze ndị Juda na Jerusalem. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma Neko duuru Jehoahaz nwanne nwoke Eliakịm gaa Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.