Native Bible

2 Chronicles 36:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị.

2 Chronicles 36:15 in English

2 Chronicles 36:15 · Berean Standard Bible

Again and again * the LORD, the God of their fathers, sent word to His people through His messengers because He had compassion on them and on His dwelling place.

Context

13Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute Onyenwe anyị, Chineke Izrel. 14Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem. 15Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị. 16Ma ha kwara ndị amụma Chineke ndị a emo, lelịa okwu Chineke ha wetara anya, chịa amụma ha buru ọchị, tutu ruo mgbe ha kpasuru ọnụma Onyenwe anyị megide ndị ya, ruo mgbe ihe ọbụla na-adịghịkwa nke pụrụ igbochi ngosipụta oke ọnụma a. 17Ya mere, o welitara eze Kaldịa imegide ha, bụ onye ji mma agha gbuchapụ ụmụ okorobịa ha nʼụlọ ebe nsọ ha. O nweghịkwa ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa, maọbụ ụmụ agbọghọ dị, ndị okenye maọbụ ndị nrịa nrịa. Chineke weere ha niile nyefee ha nʼaka Nebukadneza.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.