2 Ihe E Mere 36:14
2 Chronicles 36:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem.
2 Chronicles 36:14 in English
2 Chronicles 36:14 · Berean Standard Bible
Furthermore, all the leaders of the priests and the people multiplied their unfaithful deeds, following all the abominations of the nations, and they defiled the house of the LORD, which He had consecrated in Jerusalem.
Context
12O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke ya, o wedaghị onwe ya ala nara ndụmọdụ Jeremaya bụ onye amụma, onye na-ekwu okwu nke Onyenwe anyị. 13Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute Onyenwe anyị, Chineke Izrel. 14Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem. 15Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị. 16Ma ha kwara ndị amụma Chineke ndị a emo, lelịa okwu Chineke ha wetara anya, chịa amụma ha buru ọchị, tutu ruo mgbe ha kpasuru ọnụma Onyenwe anyị megide ndị ya, ruo mgbe ihe ọbụla na-adịghịkwa nke pụrụ igbochi ngosipụta oke ọnụma a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.