Native Bible

2 Chronicles 35:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido.

2 Chronicles 35:22 in English

2 Chronicles 35:22 · Berean Standard Bible

Josiah, however, did not turn away from him; instead, in order to engage him in battle, he disguised himself. He did not listen to Neco’s words from the mouth of God, but went to fight him on the Plain of Megiddo.

Context

20Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha. 21Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.” 22Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido. 23Ma mgbe ndị nʼagba ụta gbatara eze, bụ Josaya ụta, eze gwara ndị ozi ya sị, “Bupunụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.” 24Ya mere, ha sitere nʼụgbọ agha ya bulie ya bubanye ya nʼime ụgbọ agha ọzọ, bulata ya na Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ. E liri ya nʼili nna nna ya ha, ndị Juda na Jerusalem niile ruuru ya uju.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.