Native Bible

2 Chronicles 35:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.”

2 Chronicles 35:21 in English

2 Chronicles 35:21 · Berean Standard Bible

But Neco sent messengers to him, saying, “What is the issue between you and me, O king of Judah? I have not come against you today, but I am fighting another dynasty. God told me to hurry; so stop opposing God, who is with me, or He will destroy you!”

Context

19Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a. 20Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha. 21Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.” 22Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido. 23Ma mgbe ndị nʼagba ụta gbatara eze, bụ Josaya ụta, eze gwara ndị ozi ya sị, “Bupunụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.