Native Bible

2 Chronicles 33:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.

2 Chronicles 33:7 in English

2 Chronicles 33:7 · Berean Standard Bible

Manasseh even took the carved image he had made and set it up in the house of God, of which God had said to David and his son Solomon, “In this temple and in Jerusalem, which I have chosen out of all the tribes of Israel, I will establish My Name forever.

Context

5O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe nʼogige abụọ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 6O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya. 7O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.” 9Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.