2 Ihe E Mere 33:6
2 Chronicles 33:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya.
2 Chronicles 33:6 in English
2 Chronicles 33:6 · Berean Standard Bible
He sacrificed his sons in the fire * in the Valley of Hinnom. He practiced sorcery, divination, and witchcraft, and consulted mediums and spiritists. He did great evil in the sight of the LORD, provoking Him to anger.
Context
4O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.” 5O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe nʼogige abụọ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 6O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya. 7O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.