Native Bible

2 Chronicles 33:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile.

2 Chronicles 33:18 in English

2 Chronicles 33:18 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Manasseh, along with his prayer to his God and the words of the seers who spoke to him in the name of the LORD, the God of Israel, they are indeed written in the Chronicles of the Kings of Israel.*

Context

16Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja Onyenwe anyị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee Onyenwe anyị Chineke nke Izrel ofufe. 17Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a. 18Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile. 19Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma. 20Manase sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼụlọeze ya. Amọn, ọkpara ya, nọchiri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.