Native Bible

2 Chronicles 33:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a.

2 Chronicles 33:17 in English

2 Chronicles 33:17 · Berean Standard Bible

Nevertheless, the people still sacrificed at the high places, but only to the LORD their God.

Context

15O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha. 16Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja Onyenwe anyị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee Onyenwe anyị Chineke nke Izrel ofufe. 17Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a. 18Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile. 19Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.