2 Ihe E Mere 32:3
2 Chronicles 32:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a.
2 Chronicles 32:3 in English
2 Chronicles 32:3 · Berean Standard Bible
he consulted with his leaders and commanders about stopping up the waters of the springs outside the city, and they helped him carry it out.
Context
1Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya. 2Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem, 3Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a. 4Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha. 5Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.