2 Ihe E Mere 32:2
2 Chronicles 32:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem,
2 Chronicles 32:2 in English
2 Chronicles 32:2 · Berean Standard Bible
When Hezekiah saw that Sennacherib had come to make war against Jerusalem,
Context
1Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya. 2Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem, 3Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a. 4Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.