Native Bible

2 Chronicles 31:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.

2 Chronicles 31:18 in English

2 Chronicles 31:18 · Berean Standard Bible

The genealogy included all the little ones, wives, sons, and daughters in the whole assembly. For they had faithfully consecrated themselves as holy.

Context

16Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị. 17Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị. 18Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ. 19A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị. 20Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.