Native Bible

2 Chronicles 29:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.

2 Chronicles 29:27 in English

2 Chronicles 29:27 · Berean Standard Bible

And Hezekiah ordered that the burnt offering be sacrificed on the altar. When the burnt offering began, the song of the LORD and the trumpets began as well, accompanied by the instruments of David king of Israel.

Context

25O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya. 26Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ. 27Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel. 28Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ. 29Mgbe ha chụchara aja ndị ahụ, eze na ndị niile nọ nʼebe ahụ gburu ikpere nʼala, kpọkwaa isiala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.