Native Bible

2 Chronicles 29:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ.

2 Chronicles 29:26 in English

2 Chronicles 29:26 · Berean Standard Bible

The Levites stood with the instruments of David, and the priests with the trumpets.

Context

24Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile. 25O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya. 26Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ. 27Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel. 28Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.