2 Ihe E Mere 28:15
2 Chronicles 28:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
2 Chronicles 28:15 in English
2 Chronicles 28:15 · Berean Standard Bible
Then the men who were designated by name arose, took charge of the captives, and provided from the plunder clothing for the naked. They clothed them, gave them sandals and food and drink, anointed their wounds, and put all the feeble on donkeys. So they brought them to Jericho, the City of Palms, to their brothers. Then they returned to Samaria.
Context
13Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.” 14Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile. 15Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria. 16Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka. 17Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.