Native Bible

2 Chronicles 28:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.

2 Chronicles 28:14 in English

2 Chronicles 28:14 · Berean Standard Bible

So the armed men left the captives and the plunder before the leaders and all the assembly.

Context

12Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta. 13Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.” 14Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile. 15Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria. 16Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.