Native Bible

2 Chronicles 26:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.

2 Chronicles 26:5 in English

2 Chronicles 26:5 · Berean Standard Bible

He sought God throughout the days of Zechariah, who instructed him in the fear * of God. And as long as he sought the LORD, God gave him success.

Context

3Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem. 4O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 5Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu. 6O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia. 7Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.