2 Ihe E Mere 25:8
2 Chronicles 25:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.”
2 Chronicles 25:8 in English
2 Chronicles 25:8 · Berean Standard Bible
Even if you go and fight bravely in battle, God will make you stumble before the enemy, for God has power to help and power to overthrow.”
Context
6O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel. 7Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem. 8A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.” 9Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?”
Onye nke Chineke ahụ zara, “Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.” 10Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.