Native Bible

2 Chronicles 25:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem.

2 Chronicles 25:7 in English

2 Chronicles 25:7 · Berean Standard Bible

But a man of God came to him and said, “O king, do not let the army of Israel go with you, for the LORD is not with Israel—not with any of the Ephraimites.

Context

5Amazaya kpọkọtara ndị Juda, guzo ha dịka ezinaụlọ ha si dị, kenye ha nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndị na-achị ọtụtụ narị ndị agha, bụ ndị Juda na ndị Benjamin niile. Mgbe ọ gụrụ ndị dị afọ iri abụọ maọbụ karịa ọnụ, ọ chọpụtara na ha dị narị puku ndị ikom atọ ndị tozuru iji ùbe na ọta buo agha. 6O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel. 7Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem. 8A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.” 9Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?” Onye nke Chineke ahụ zara, “Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.