2 Ihe E Mere 24:6
2 Chronicles 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?”
2 Chronicles 24:6 in English
2 Chronicles 24:6 · Berean Standard Bible
So the king called Jehoiada the high priest and said, “Why have you not required the Levites to bring from Judah and Jerusalem the tax imposed by Moses the servant of the LORD and by the assembly of Israel for the Tent of the Testimony?”
Context
4Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ. 5Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa. 6Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?” 7Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal. 8Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.