Native Bible

2 Chronicles 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa.

2 Chronicles 24:5 in English

2 Chronicles 24:5 · Berean Standard Bible

So he gathered the priests and Levites and said, “Go out to the cities of Judah and collect the money due annually from all Israel, to repair the house of your God. Do it quickly.” The Levites, however, did not make haste.

Context

3Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 4Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ. 5Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa. 6Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?” 7Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.