Native Bible

2 Chronicles 24:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

2 Chronicles 24:21 in English

2 Chronicles 24:21 · Berean Standard Bible

But they conspired against Zechariah, and by order of the king, they stoned him in the courtyard of the house of the LORD.

Context

19Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị. 20Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ” 21Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 22Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.” 23O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.