2 Ihe E Mere 24:19
2 Chronicles 24:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
2 Chronicles 24:19 in English
2 Chronicles 24:19 · Berean Standard Bible
Nevertheless, the LORD sent prophets to bring the people back to Him and to testify against them; but they would not listen.
Context
17Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị. 18Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem. 19Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị. 20Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ” 21Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.