Native Bible

2 Chronicles 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”

2 Chronicles 23:7 in English

2 Chronicles 23:7 · Berean Standard Bible

The Levites must surround the king with weapons in hand, and anyone who enters the temple must be put to death. You must stay close to the king wherever he goes.”

Context

5Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị. 6Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata. 7Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.” 8Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile. 9O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.