Native Bible

2 Chronicles 22:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya.

2 Chronicles 22:11 in English

2 Chronicles 22:11 · Berean Standard Bible

But Jehoshabeath * daughter of King Jehoram took Joash son of Ahaziah and stole him away from among the sons of the king who were being murdered, and she put him and his nurse in a bedroom. Because Jehoshabeath, the daughter of King Jehoram and the wife of Jehoiada the priest, was Ahaziah’s sister, she hid Joash from Athaliah so that she could not kill him.

Context

9Ọ pụrụ ịchọ Ahazaya. Ndị ozi ya jidere ya ebe o zoro onwe ya na Sameria. Ha kpụtaara ya Jehu onye gburu ya. Ha liri ya, nʼihi na ha kwuru sị, “Nwa Jehoshafat ka ọ bụ, onye jiri obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị.” Ya mere, o nwekwaghị onye dị ike nʼụlọ Ahazaya ijide alaeze ahụ. 10Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda. 11Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya. 12Ya na ha nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Chineke, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.