Native Bible

2 Chronicles 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda.

2 Chronicles 22:10 in English

2 Chronicles 22:10 · Berean Standard Bible

When Athaliah the mother of Ahaziah saw that her son was dead, she proceeded to annihilate all the royal heirs of the house of Judah.

Context

8Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile. 9Ọ pụrụ ịchọ Ahazaya. Ndị ozi ya jidere ya ebe o zoro onwe ya na Sameria. Ha kpụtaara ya Jehu onye gburu ya. Ha liri ya, nʼihi na ha kwuru sị, “Nwa Jehoshafat ka ọ bụ, onye jiri obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị.” Ya mere, o nwekwaghị onye dị ike nʼụlọ Ahazaya ijide alaeze ahụ. 10Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda. 11Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya. 12Ya na ha nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Chineke, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.