2 Ihe E Mere 21:11
2 Chronicles 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.
2 Chronicles 21:11 in English
2 Chronicles 21:11 · Berean Standard Bible
Jehoram had also built high places on the hills of Judah; he had caused the people of Jerusalem to prostitute themselves and had led Judah astray.
Context
9Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu. 10Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa.
Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ. 11O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda. 12Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị:
“Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda, 13kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.